Hosiya 8

Izrel echezọọla Onye kere ha ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”

Hosea 8:14 (UKJV) For Israel has forgotten his Maker, and builds temples; and Judah has multiplied fenced cities: but I will send a fire upon his cities, and it shall devour the palaces thereof.

12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.

13Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.

14Izrel echezọọla Onye kere ha ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.