Aịzaya 1

Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.

Isaiah 1:7 (UKJV) Your country is desolate, your cities are burned with fire: your land, strangers devour it in your presence, and it is desolate, as overthrown by strangers.

5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.

6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ.

7Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.

8Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.

9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.