26Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
27Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ. Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi, wezuga ibu arọ unu.
28Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!