12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
13Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
15Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
16Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.