2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.