1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.