Aịzaya 11

Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.

Isaiah 11:9 (UKJV) They shall not hurt nor destroy in all my holy mountain: for the earth shall be full of the knowledge of the LORD, as the waters cover the sea.

7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.

8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.

9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.

10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.

11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.