14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ, onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha; a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha; ọ dịkwaghị ọlaedo maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa; ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere, maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.