20Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya. Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
21Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara. Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa, na ikwighịkwighị, nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
22A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike. Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ. Lee na oge ha ji emezu adịla nso, a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.