2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.
6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.