22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.