21Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”