19Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
20A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
21Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.