4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.
6Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.