Aịzaya 17

Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.

Isaiah 17:6 (UKJV) Yet gleaning grapes shall be left in it, as the shaking of an olive tree, two or three berries in the top of the uppermost bough, four or five in the utmost fruitful branches thereof, says the LORD God of Israel.

4“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.

5Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ, na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka nʼime Ndagwurugwu Refaim.

6Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.

7Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha, nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.

8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee. Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera, maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.