1Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.