Aịzaya 19

Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.

Isaiah 19:3 (UKJV) And the spirit of Egypt shall fail in the midst thereof; and I will destroy the counsel thereof: and they shall seek to the idols, and to the charmers, and to them that have familiar spirits, and to the wizards.

1Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.

2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.

3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.

4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”

5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.