9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu, ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie; ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile eduhiela ndị Ijipt ụzọ.