6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.
8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.