2Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.