Aịzaya 23

Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

Isaiah 23:18 (UKJV) And her merchandise and her hire shall be holiness to the LORD: it shall not be treasured nor laid up; for her merchandise shall be for them that dwell before the LORD, to eat sufficiently, and for durable clothing.

16“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo, gị nwanyị akwụna e chefuru echefu; kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”

17E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile.

18Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.