Aịzaya 24

Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.

Isaiah 24:2 (UKJV) And it shall be, as with the people, so with the priest; as with the servant, so with his master; as with the maid, so with her mistress; as with the buyer, so with the seller; as with the lender, so with the borrower; as with the taker of interest, so with the giver of interest to him.

1Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ. Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa, mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.

2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.

3O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.

4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.