Aịzaya 24

Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.

Isaiah 24:4 (UKJV) The earth mourns and fades away, the world languishes and fades away, the haughty people of the earth do languish.

2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.

3O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.

4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.

5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.

6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.