4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.
5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.
6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.
7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
8Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.