6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.
7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
8Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa; mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
10Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.