8Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa; mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
10Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
11Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa. Ọṅụ adịghịkwa, otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.
12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe, e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.