20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu. Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị. Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ, nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.
21Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ. Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.
22A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.
23Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.