10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya, dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya, ma Chineke ga-eweda mpako ha niile, nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.
12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike, mee ka ha daruo ala, ọ ga-eme ka ha daruo ala, ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.