1Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.
2Meghee ụzọ ama niile, ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata, e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.