4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba; ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha, ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo, na ndo nʼoge okpomọkụ. Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,
5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara. Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị, dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ, otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.
6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.
7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.
8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.