7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.
8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.
9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya, dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya, ma Chineke ga-eweda mpako ha niile, nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.