13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.
15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.