15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
18Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze, ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya. Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka. O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
19Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.