Aịzaya 27

Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.

Isaiah 27:11 (UKJV) When the boughs thereof are withered, they shall be broken off: the women come, and set them on fire: for it is a people of no understanding: therefore he that made them will not have mercy on them, and he that formed them will show them no favour.

9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.

10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.

11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.

12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.

13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.