Aịzaya 27

Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.

Isaiah 27:2 (UKJV) In that day sing all of you unto her, A vineyard of red wine.

1Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.

2Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.

3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.

4Adịghị m ewekwa iwe. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba, aga m ebili buso ha agha, aga m esurekwa ha ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.