1Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.
2Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.