19Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị. Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie. Unu ndị niile bi nʼaja tetanụ ma tie mkpu ọṅụ. Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ, ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.
20Baanụ nʼụlọ, ndị m, kpọchienụ ụzọ unu! Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta, tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.
21Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.