9“Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara?
10Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”
11Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe.
12Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị.
13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.