Aịzaya 28

Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.

Isaiah 28:13 (UKJV) But the word of the LORD was unto them precept upon precept, precept upon precept; line upon line, line upon line; here a little, and there a little; that they might go, and fall backward, and be broken, and snared, and taken.

11Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe.

12Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị.

13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.

14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.

15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.