20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.
21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.
22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.
23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.
24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?