Aịzaya 28

Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.

Isaiah 28:21 (UKJV) For the LORD shall rise up as in mount Perazim, he shall be angry as in the valley of Gibeon, that he may do his work, his strange work; and bring to pass his act, his strange act.

19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.

21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.

22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.

23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.