Aịzaya 28

Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

Isaiah 28:19 (UKJV) From the time that it goes forth it shall take you: for morning by morning shall it pass over, by day and by night: and it shall be a vexation only to understand the report.

17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.

18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu.

19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.

21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.