Aịzaya 28

Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu.

Isaiah 28:18 (UKJV) And your covenant with death shall be disannulled, and your agreement with hell shall not stand; when the overflowing scourge shall pass through, then all of you shall be trodden down by it.

16Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala. Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike. Onye nke kweere na ya egwu agaghị ejide ya.

17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.

18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu.

19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.