8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.
9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”