1“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
2Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
3Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.