Aịzaya 30

Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.

Isaiah 30:3 (UKJV) Therefore shall the strength of Pharaoh be your shame, and the trust in the shadow of Egypt your confusion.

1“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.

2Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.

3Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.

4Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans,

5ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.