16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
17Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”
18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.