31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
32Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
33Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga. A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ. Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi, na nke a kwajuru nkụ. Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.