1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.
2Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.
3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.