Aịzaya 31

Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

Isaiah 31:3 (UKJV) Now the Egyptians are men, and not God; and their horses flesh, and not spirit. When the LORD shall stretch out his hand, both he that helps shall fall, and he that is helped shall fall down, and they all shall fail together.

1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.

2Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.

3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

4Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu, nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, ọ naghị atụ egwu mkpu ha, mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu, Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.

5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya, otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem, ọ ga-ekpuchi ya napụta ya, ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.